Take a fresh look at your lifestyle.

Amina Mohammed :Agaala Naịjirịa ka ọ gaa nnabata ndị gọvanọ ọhụrụ.

Piaku Kanu dere ya na bekee.

0 234

Osote odeakwụkwọ ukwu nke mba United Nations bụ Amina Mohammed agaala Naịjirịa ka ọ gaa nnabata ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị lọta.

Onye na-ekwuchitere onye odeakwụkwọ ukwu, Stéphane Dujarric kwupụtara nke a n’oge mkparịta ụka akụkọ n’isi ụlọ ọrụ UN dị na New York, United States na Fraịde, Mee 12, 2023.

“Akpọọla ya òkù ka ọ bịa na 2023 Nigeria Governors’ Induction Forum maka ndị Gọvanọ ọhụrụ na ndị na-alọta ga-amalite na Mọnde, Mee 14.

“N’oge mmemme mmeghe ahụ, osote odeakwụkwọ ukwu ga-enye okwu dị mkpa n’isiokwu bụ “Ọrụ nke Ụlọ Mba”.

Ọ sịrị, “Ọ ga-ezutekwa ndị isi gọọmentị, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị otu UN na Nigeria,” ka o kwuru.

Dị ka ọnụ na-ekwuchitere, Mohammed ga-alọghachi na New York na Tuzdee, Mee 16.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *