Take a fresh look at your lifestyle.

Nwoke ọ ga-aza aha nna nwunye ya n’ala Igbo?

CHIGO

0 317

Nwoke ọ ga-aza aha nna nwunye ya n’ala Igbo?

Ọ bụghị omenaala ndị Igbo na nwaanyị ga-aza aha di ya dịka usoro Bekee na-akpọ ‘surname’ mgbe gboo, mana ugbua, ndị Igbo anabatala usoro Bekee ji eme ya. Nwaanyị na azazị aha di ya, mere o ji bụrụzịa omenaala nke ọgbara ọhụrụ.

Ya mere, ọ ga-abụ ihe mgbawoju anya ma nwoke Igbo sị na ọ bụ aha nna nwunye ya ka ọ ga-aza.

Ndị ụmụnna ya nwere ike inyocha ya ka ha nwee ike ibo nwunye ya ebubo na o ji ọgwụ kechie ya. Ha nwekwara ike iwe ya na ọ gọpụla onwe ya n’ezinaụlọ ha, ma bụrụzịa onye ezinaụlọ nwunye ya.

Ajụjụ dị iche iche bụ ihe ụmụnna ya ga-akpụ n’ọnụ dị ka:

  • Ọ ga-ahapụ iketa oke n’ụlọ nna ya? N’ihi na ọ bụ aha ya ga-enye ya ikike iji eketa oke.
  • Ọ ga-ahapụ ezinaụlọ ya kwaba biri nakwa bụrụ onye ezinaụlọ nwunye ya?
  • Ndị ezinaụlọ nwunye ya a ga-ahapụ ya ka ọ banye ma bụrụ onye otu nzukọ ha?
  • Ọ ga-eketanwu oke dị ka ala na ụlọ n’ezinaụlọ nwunye ya?
  • BBC

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *