Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị akaebe hụrụ etu mgbọ ndị NSCDC si tụgbuo nwa ọhụrụ n’Owerri – Ndị Uweojii

0 470

Akụkọ fesara etu mgbọ egbe si tụgbuo otu nwa ọhụrụ ebe ụfọdụ na-ekwukwa na mgbọ tụguru nne nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ahụ oge ha kwụ n’okporoụzọ na-eche ụgbọala ha ga-abanye.

Oge onye ntaakụkọ anyị jụrụ ndị uweojii Imo Steeti gbasara akụkọ a, ha kwuru na ha amalitela nnyocha, mana ihe ha chọpụtarala bụ na aka ndị ọrụ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ (NSCDC) nwereike ịdị na ya bụ ihe.

Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti gwara onye ntaakụkọ anyị sị:

“Ndị akaebe hụrụ ihe merenụ gwara anyị na ọ bụ mgbọ si n’egbe nke otu onye ọrụ NSCDC gbara tụrụ nwaanyị ahụ na nwa ya. E bugara ha ụlọ ọgwụ ngwangwa ebe a nọrọ kwuo na nwa ahụ anwụọla.”

“Mana ihe a ndị akaebe gwara anyị apụtaghị na anyị akwụsịla ime nnyocha iji mata kpọmkwem ihe merenụ. Nnyocha ka na-aga n’ihu,” Okoye kwuru.

Akụkọ kwuru na nne na nwa ahụ mgbọ tụrụ nwụrụ, mana nwaanyị nke ọzọ mgbọ tụtara, bụ onye a na-eche na ọ bụ nne nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ, anwụghị.

Otu onye hụrụ ebe ihe a mere gwara onye ntaakụkọ anyị na ihe a merenụ tụrụ ya n’anya n’ihi na ya na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ kelechara ya obere oge tupu ya bụ ihe emee.

“Ya na nne ya kwụ n’akụkụ ụzọ na-eche ụgbọala, nne ya ku nwa ọhụrụ ahụ. Mụ na ha kwụ ebe ahụ ma kparịta nkata. Mana oteghị aka m gara ịzụta ihe n’akụkụ okporoụzọ, lezikwaa otu ndị ahụ ka ha dina ala n’ozu.”

Aka anyị adịghị n’ọnwụ nwata ahụ – NSCDC Imo Steeti

Ndi ntaakuko kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị NSCDC Imo Steeti, bụ Lowell Chimeziri, n’ekwentị n’ụtụtụ Tọzde, mana ọ sị ka a kpọghachi ya azụ n’ihi na ọ nọ n’ọgbakọ.

Mana ụlọ ntaakụkọ Vanguard dere akụkọ ebe Chimeziri kwuru na aka ha adịghị n’ọnwụ nwata ahụ aha ya bụ Chidalu.

Chimeziri kwuru sị: “Anyị matara maka ọnwụ nwata ahụ oge ndị nwe ya bwetara mkpesa n’ụlọọrụ anyị ma na-ekwu na ọ bụ mgbọ si n’egbe onye otu anyị gburu ya, dịka ndịọrụ anyị nọ n’ụgbọala Hilux gbafere na mpaghara ‘Fire Service Roundabout’.”

“Ihe ndị njọ n’akụkọ a bụ na ezinụlọ Chidaalu kwenyara na ndị nọ n’ime ụgbọala Hilux ahụ bụ ndịọrụ NSCDC, mana ọ bụghị eziokwu. Ọbụghị otu a ka anyị si arụ ọrụ.”

Chimeziri kwuru na e nwere ọtụtụ ụlọọrụ nwere ụgbọala hilux ọcha, ọ bụghị naanị ndị NSCDC, “onweghị mgbe a ga-eji ụdị ihe ọjọọ dị otu a tụnyere ngalaba NSCDC”, ka o kwuru.

“N’oge adịghị anya, site n’amara Chukwu, anyị ga-apịachi nnyocha anyị ma chọpụta ndị mere ihe a, ma mee ka ikpe ziri ezi guzo.”

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *