Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ndịisi okpotokpo Alex Otti họpụtara maka idu ya n’iyi ọrụ

0 308

Onye a họpụtara dịka gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti ehiwela kọmitii ndị ga-ahụ na o weere ọchịchị na-enweghi nsogbu ọbụla a kpọro ‘transition committee’.

Ndị a ọ họpụtara bụ ndị nwere agba na ngalaba dị icheiche gụnyere; azụmaahịa, ihe banyere ụlọakwụ nakwa akụnaụba, mmanụ agbidi dgz.

Ha gụnyere Victor Onyenkpa nke ụlọọrụ KPMG, Ifueko Okauru, onye bụbu onyeisi FIRS, Arunma Oteh bụbu onyeisi ngalaba Nigeria’s Securities and Exchange Commission (SEC) ma rụbuo ọrụ n’ụlọakụ mbaụwa.

Ndị ọzọ bụ Ndubuisi Ekekwe, onye rụrụ ọrụ n’ụlọọrụ ekwentị Apple, Uche Orji bụbu onyeisi Nigeria Sovereign Investment Authority (NSIA), Victor Okoronkwo onyeisi ụlọọrụ mmanu agbidi Aiteo Oil and Gas, Frank Nneji so nwere ụlọọrụ ụgbọala ABC, Ide John Udeagbala onye ojiego achụntaego n’Aba.

A ga-edu ha n’iyi ọrụ n’ụbọchị Fraịde abali irianonke onwa Eprelụ, 2023 n’ọdọ azụmaahịa Abia steeti bụ Aba.

Otti kwuru na ọ ga-eme ya n’Aba maka atụmatụ pụrụiche o nwere ịhụ na Aba ga-abụ ezi obodo ụlọọrụ na azụmaahịa n’ọchịchị ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *