Take a fresh look at your lifestyle.

Ooni nke Ife na-emepe ụbọchị okpukperechi Africa na Brazil.

Qasim Akinreti dere ya na bekee.

0 422

 

Onye so n’isi ndi kachaa mkpa n’ọchịchị ma sorokwa na ndi bu ndi  isi oche na usoro ọchịchị ọdinala ma burukwa onye eze ukwu e chiri Ooni nke Ife bụ onye eji Adeyeye Enitan Ogunwusi ,Ojaja 11,were mara. , ewepụtala ụbọchị okpukpe ọdịnala Africa nke a na-akpọ ụbọchị Isese, na Brazil.

Ọ malitere ụbọchị okpukperechi ahụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ, Obí Onye isi ala, Brazil, mgbe Onye isi ala Lula da Silva nabatara ya dịka akụkụ nke nleta ọrụ na Sao Paulo, Rio De Janeiro, Salvador, Bahia na Brasilia.

Eze ukwu a,  bụ Adeyeye Enitan Ogunwusi, nọ na Brazil na-aga n’ihu na njem nlegharị anya zuru ụwa ọnụ maka Agenda Udo na Ọganihu Ndị Africa yana ekpughere atumatu maka ichikota ihe karịrị 100 nde Afro-Brazil site na mmemme ya nke akpọrọ “LỌTA ỤLO.”

O jiri nleta ahụ nwee ekele maka onyinye pụrụ iche nke ndị Afro-Brazil na-enye mba ahụ ma gbaa Onye isi ala Lula ume ka ọ ghara imebi nkwa ya maka ọchịchị na-akwado Africa.

“Enwere m ike icheta nke ọma okwu gị banyere ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe ndị Africa nọ n’oge nleta gị na Nigeria na 2003 mgbe onye isi ala Olusegun Obasanjo nọ n’ọfịs. Anyị nwere gị na ekpere anyị, anyị na-ekpekwa ekpere ka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile Olodumare (Chineke) nọgide na-anọnyere gị. Afrịka ji gị nganga.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *