Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ steeti Legoosi toro ndị na-ahụ maka anya na Naịjirịa.

Stephnie Simon dere ya na bekee.

0 504

Gọvanọ Lagos steeti toro ndị na-ahụ maka anya na Naịjirịa.

Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu etoola ndị dọkịta anya na-eme ihe na Naịjirịa. O gosipụtara afọ ojuju maka ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị dọkịta anya na mba ahụ, n’agbanyeghị na ufodu a gala mba ofesi.

Gọvanọ ahụ mere ka a mara nke a n’ụbọchị Tọzdee na ogbako nke Nigeria Optometric Association (NOA), nke Steeti Legọọsi, haziri iji mee emume kwa afọ nke ncheta ha.

 

Nzukọ a, nke nwere isiokwu: “Onye na-ahụ maka anya: Na-enye ọhụụ maka mmadụ niile”, ewepụtara iji mee emume onye ọ bụla na-ahụ maka anya maka ọrụ ha na nlekọta anya.

Ụbọchị mmemme malitere na 1986 site na International Optometric and Optical League iji mata ọrụ na-eto eto nke Optometry n’ụwa na ọrụ dị mkpa ha na-arụ n’inye ndị mmadụ nlekọta anya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *