Take a fresh look at your lifestyle.

“Dọọ Inec aka na ntị” – NLC gwara Buhari

0 241

Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ ‘Nigeria Labour Congress’ (NLC) ekwupụtala mgbagwoju anya ha n’etu ngụkọ ntuliaka si aga, ma kwukwaa na ụjọ na-atụ ha maka ọgbaaghara ya bụ ihe nwere ike ibute na Naịjirịa.

Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero kwuru nke a n’ime akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde ebe o kwuru sị: “anyị na-ekwupụta uche anyị maka ihe dịka nrụrụaka a na-eme na mpụtara ntuliaka nke Legọs na Rivers Steeti, ma na-akpọ oku ka amalita itinye mpụtara ntuliaka n’ọbaozi Inec n’egbughị oge ọbụla.

“Inec kwesịrị ịghọta na ọ bụrụ na ha etinyeghị mpụtara ntuliaka n’ọbaozi ‘server’, o nwereike ibute ọgbaaghara,” Ajaero dere.

“Anyị na-akpọ oku ka Inec nyochaa otu onye ọrụ ha na ngalaba tekịnụzụ onye aka ya nwereike ịdị n’ihe mere o ji sie ike iziga mpụtara ntuliaka site na BVAS gaa n’ọba ozi ‘server”.

NLC boro ebubo na nwoke na-elekọta ngalaba tekịnụzụ nke Inec “bụbu kọmishọna na Legọs steeti aha ya bụ Femi Odubuyi”.

“Anyị na-akpọ Onyeisiala Muhammdu Buhari ka o bilie ma dọọ Inec aka na ntị ka ha soro usoro niile dị n’akwụkwọ isu ntuliaka na ngụkọ vootu nke na-aga n’ihu ugbua.”

“Naanị ime nke a ka onyeisiala ga eji mee ka ụmụ Naịjirịa mata n’ezie na aka ya adịghị na ejije a na-aga n’ihu ugbua.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *