Take a fresh look at your lifestyle.

Etu AI ga-esi metụta gị n’ụlọọrụ gị n’afọ a.

CHIGO.

0 557

Etu AI ga-esi metụta gị n’ụlọọrụ gị n’afọ a.

Ejike Ozonkwo bụ onye ọnụ na-eru n’okwu maka ihe gbasara tekụnụzụ ọkachasị nke AI kwuru maka etu AI ga-esi enyere ndụ mmadụ aka n’afọ 2023.

Ozonkwo kwuru sị, ” Onye nọ n’ụlọọrụ, AI nwere ike ime ka ị rụọ ọrụ gị ọsịsọ. Ndị na-arụ dịka na ngalaba mgbakọ na mwepụ, AI ga-eme ka ha mee nnyocha ma wepụta mpụtara nnyocha ha na-egbughị oge”.

O kwukwara sị, ” A bịa na nzụkọ a na-eme n’ụlọọrụ, AI nwere ike ịdetu ihe niile e kwuru na ya bụ nzụkọ ma onye kwuru ya. ”

“O ga-emecha depụta edemede maka ya bụ nzụkọ ma zịgakwa ya site na email”.

Ozonkwo kwuru na ndị tekụnụzụ na-eme ‘programming’ nwer eike iji AI mee ka ọ dịrị ha mfe ma hazie ka ọ dịrị onye ọzọ mfe ịghọta ihe onye ahụ chọrọ ime.

O kọwara sị na AI nwereike ị dere mmadụ edemede email ya dịka etu mmadụ ga-esi dee ya.

BBC

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *