Tupu e kwuo okwu ọgwụgwọ, Akinde nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ịgba mbọ debe onwe ha ọcha.
“Ị debe ebe ahụ ọcha bụ naanị ihe kachasị mma ga-egbo nsogbu ibute ọrịa a” ka o kwuru.
A bịazie n’okwu ọgwụgwọ, ọ kwuru na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ gaa n’ụlọogwụ, nyochaa onwe ha ọfụma ma ṅụchaa ọgwụ niile e nyere ha.
“Ndị mmadụ na-emekaarị ha nwete ọgwụ ṅụọ ya abalị abụọ, ọrịa mee ka ọ lawala, ha akwụsị ịṅụ ọgwụ”
Ọ kọwara na agwa a jogburu onwe ya n’ihi na nje butere ọrịa ahụ ka dị ndụ na-enye nsogbu.
O kwukwara na agwọghị ọrịa a ọfụma ga-eme ka ọ dịrịzịa ka ọrịa ala ala mana o kwesighi ị dị etu ahụ.
Leave a Reply