Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-egoro PVC ndị mmadụ na-egbu onwe ha oge – INEC

0 542

Ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) ekwuola na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-egoro akwụkwọ ikike ịtụ vootu n’aka ndị mmadụ, n’ụzọ iji were ya mee nrụrụaka na ntuliaka 2023, na-egbu onwe ha oge.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru nke a n’abalị ụbọchị Sọnde na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV.

Okoye kwuru na igwe ọgbaraọhụrụ a kpọrọ ‘Biomodal Voter Registration System (BVAS) nke Inec ga-eji hazie ya bụ ntuliaka agaghị ekwe ka nrụrụaka ọbụla gaa n’ihu.

“Onweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ga-aghọgbunwu BVAS. Ọ gaghị ekwe omume,” Festus Okoye kwuru.

“Onye ọbụla na-azụ PVC na-egbu onwe ya oge. Naanị ihe ọ ga-emeli bụ na onye nwe PVC ahụ agaghịzi atụ vootu, mana onweghị onye ga-ejinwu PVC onye ọzọ wee tụọ vootu n’ụbọchị ntuliaka, maka na BVAS agaghị anabata mkpịsịaka onye ahụ.”

Festus Okoye bụ onyeisi mgbasaozi n’ụlọọrụ InecImage caption: Festus Okoye bụ onyeisi mgbasaozi n’ụlọọrụ Inec

Festus Okoye nyere nkọwa a dịka akụkọ na-ekwu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-azụrụ PVC ndị mmadụ.

Otu abụọ welitere isi na Naịjirịa etiela mkpu maka nke a, ma kpọọ oku ka ndị ọrụ nchekwa jichie ndị na-eme ihe dị otu a. Otu ndị a bụ ‘Northern Elders Forum’, na ‘Socio-Economic Rights and Accountability Project’.

Okoye kọwakwara na ọ bụ ihe megidere iwu mmadụ iji PVC onye ọzọ chọọ ịtụ vootu, onye dara iwu a nwereike ịga mkpọrọ maọbụ a daa ya nha.

O kwuru na Inec nwere BVAS ga-ezu maka ọgbọ ntuliaka 176,000 dịna Naịjirịa, ma nwekwaa ụfọdụ e dopuru iche ,aka adịghị ama ama.

“Anyị nwekwara ndị ọrụ nwere ọzụzụ maka ime ngwangwa mezie BVAS ọbụla nwere nsogbu n’ụbọchị ntuliaka,” Okoye kọwara.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *