Ndị ụlọ omeiwu mba Saụt Afrịka nọ n’ọgbakọ ha pụrụiche taa bụ Tuzde tụọ vootu ma jụ usoro mmalite nchụpụ onyeisiala Cyril Ramaphosa na ọkwa onye.
E boro Ramaphosa ebubo ikpuchi izufu nnukwu ego e chee na e zuru ezu gaa mba ofesi site n’ụlọọrụ ugbo ya n’afọ 2020.
Cheta na a hụrụ ụfọdụ nnukwu ago a ebee zoro ya n’ime akụkụ oche.
Nrụrịtaụka a e mere na-abalị dịka ntuliaka ọkwa onyeisiala mba a na-abịa nso dịka ndị ụlọomeiwu a tinyere anya n’akwụkwọ mpụtara nnyocha n’okwu nke na-ekwu na Ramaphosa nwereike ịda iwu.
Ramaphosa, onye na-akwado ịzọ ọkwa ọzọ dịka n’aha pati African National Congress (ANC), na-ekwu na ọ nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere.
Pati ANC gwara ndị omeiwu otu pati ha ka ha gbochie usoro nchụpụ a – n’agbanyeghị na ndị otu ha ole na ole enweghị kwadoo a nke a ma na-akwado ka a nabata ihe a akwụkwọ nnyocha ahụ kwuru nke ghara ịbụ mmalite nchụpụ Ramaphosa n’ọkwa oche ya.
Ugbua Ramaphosa lanarịrị nchụpụ n’ọkwa a, a na-eche na ọ nwereike inweta mmeri na ntuliaka ọzọ dịkaANC ga-eme ntuliaka ime ụlọ n’ụbọchị Fraịde. Nke a mee, ọ ga-aga n’ịhụ ịbụ onye ga-azọrọ pati ahụ ọkwa onyeisiala na ntuliaka na-abịa n’afọ 2024
Leave a Reply