Take a fresh look at your lifestyle.

Sinetọ na-akwalite ndị ọrụ ugbo 1,000 na steeti Ebonyi.

Moses Nwite, Abakaliki dere ya na bekee.

0 647

Sinetọ na-enye ndị ọrụ ugbo 1,000 ike na steeti Ebonyi

Sinetọ na-anọchite anya Ebonyi North Senatorial Zone, Dọkịta Sam Egwu ebidola ọzụzụ ọzọ maka ndị okpuru ọchịchị ya ka ha ga-esi baa ọgaranya site n’ịrụ ọrụ ugbo.

Nke a bụ otu n’ime ọrụ okpuru ọchịchị ya maka imezu ebumnuche ya mbụ bụ ibelata ịda ogbenye na steeti ahụ.

Ọzụzụ a na mmekorita ya na Federal Cooperative College Oji River. Sinetọ Egwu kwupụtara nke a n’oge mmeghe mmemme Empowerment na Abakaliki isi obodo steeti ahụ.

Sinetọ Egwu onye Anselm Onwe nọchitere anya ya kwuru na Egwu emeela ọtụtụ ihe nye ndị steeti ahụ malite n’oge ọ bụ gọvanọ steeti ahụ ruo taa.

Onwe gwara ndị Ebonyi North Zone ka ha votu Sinetọ Egwu laghachite nzuko omeiwu mba ka ọ gaa n’ihu n’ọrụ ọma ya.

N’oge nkuzi gbasara otu esi amịpụta Azụ, Cassava, Rice na mmanụ aṅụ, onye nkuzi bụ Maazị Njoku Chukwumweolu kpọkuru ndị bịara ya ka ha tinye uche n’ihe ka ha wee mụta ya ma nwetakwa ike.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *