Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere m ji gbaa arụkwaghịm dịka mịnịsta Ọkụ – Barth Nnaji

0 341

Ọkammụta Barth Nnaji bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ latrik na Naijiria n’oge ọchịchị aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akọwaala na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị enyi ha achọghị ka ya gbasoo ụsoro ziri ezi na nhọrọ ndị ga-azụ ụlọọrụ latrik ndị gọọmentị resịrị ndị nkịtị mere ya ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm.

Nnaji bụ onye hazirị atụmatụ ire akụkụ dị iche iche metụtara ọkụ latrik na Naijiria tupu ọ gbaa arụkwaghịm n’ike n’afọ 2012 nke tụụrụ ọtụtụ ụmụ Naijirịa.                                                                                                  Na mkparịtaụka ya na ndi ntaakụkọ nwere na nsonso a, Barth Nnaji, onye rụbụrụla ọrụ inginia ọkaibe na mba Amerịka tupu ọ lọta rụwa ọrụ mịnịsta na Naịjirịa kwuru  na ya na-azọ isi onwe ya oge ahụ nke mere ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm ahụ n’ihi na ya achọghị imetọ aha ya.

Nwa afọ a bụbụkwa Minista na-ahụ maka Sayensị na Naịjirịa kwukwara na ihe abụọ mịnịstri ya mapụtara maka itozu ịzụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik a kpọrọ ‘discos’ na Bekee bụ na ụlọọrụ ọbụla ga-azụta ya ga-enwe akatamkpo ego n’akpa iji tinye n’ịrụzi ihe ndị dị mkpa.

Nke a abụọ bụ na ụlọọrụ ahụ ga-abụ nke ihe gbasara ọkụ latrik doro anya nke ukwu .

O kwuru na ọ bụ n’ihi na ya kweciri n’ịhụ na ọ bụ naanị ụlọọrụ ndị nwere ihe abụọ a bụ ndị ga-azụtali ụlọọrụ latrik nke Gọọmentị Naijiria chọrọ ire oge ahụ mere ka ndị anya ha dị n’izụ ụlọọrụ ndị a mana ha enweghị ihe a chọrọ jiri kpawara ya nkata ọjọọ.

O sịri na ọ bụrụ na ya gbara isi akwara ghara itinye akwụkwọ arụkwaghịm, a kara igbu ya.

“Ọ bụrụ na nọrọ dịka Mịnịsta , ọ ga-abụ na ha ka egburu m maọbụ na m kwetara soro ha na-emetọ aka etu ha chọrọ.”

Nnaji kwuru na ọ bụ n’ihi  na emeghị atụmatụ ahụ a kpọrọ ‘Privatatsation’ etu o kwesịrị mere na Naijiria ka na-enwe nsogbu inwe ọkụ latrịk rue ugbua.

O meela ihe karịrị afọ 10 e resịrị ndị nkiti akụkụ ụlọrụ latrik dị iche iche na Naịjirịa.

N’okwu ụlọọrụ Aba Geometric power plant, o kwupụtara ọnọdụ ọkụ dị na mpaghara Aba oge ha zere ya ma kọwa nsogbu ha nwere na ime ka atụmatụ ahụ nke o kwuru ruola pasent 97 ịbịa na mmezu.

Na nchịkọta Nnaji kwupụtara ihe mmepe ụlọọrụ ghara emere ndị bi na mpaghara ahụ ma ọ bụrụ na obido ọrụ n’ọnwa ole na ole na-abịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *