Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari laghachiri Abuja.

Bilkisu Halilu Pai .

0 318

Onyeisiala Buhari laghachiri Abuja.

Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachila Abuja ka ọ gachara nzukọ ụwa nke bio na Seoul, South Korea.

Anabatara ya na mbata site n’aka onye isi ndị ọrụ ya, Prọfesọ Ibrahim Gambari na Minista nke Federal Capital Territory, Mohammed Bello yana ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa.

Mgbe ọ na-ekwu okwu n’ọgbakọ ahụ, o kwupụtara na Nigeria dị njikere iwube ebe a na-emepụta ọgwụ mgbochi.

Onyeisiala Buhari hụkwara ibinye aka na nkwekọrịta dị n’etiti Naijiria na Saụt Koria maka ịrụzi ụlọ ọrụ mmanụ ọkụ Kaduna na Warri.

Ọ zutekwara ụmụ Naịjirịa na Saụt Koria ebe ọ dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ezigbo ndị nnọchi anya obodo ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *