Take a fresh look at your lifestyle.

ỌGWỤ DļKA IHE OFUFE NDI IGBO.

Chigo dere ya.

0 510

OMENALA NA  EWUMEWU NDI IGBO.

ISIOKWU: ỌGWỤ DļKA IHE OFUFE NDI IGBO.

Nke a anyi na-ekwu maka ya bụ nke a gwọtara agwọta na bee dibia  bụ nke eji agwọ ọrịa ma ọ bụ nke eji egbochi ọria, igbabido izuzu ọjọọ di iche iche,tinyekwa nke eji eme ka ihe na-agara mmadụ nke ọma.

Mmadụ ma ọ bụ obodo nwere ike ije gwọta ọgwụ,ka ha were gbochie ihe ọjọọ dika amusu,ohi na nsị.

O nwere ndi na-agwọta ọgwụ iji gbochie ọrịa na-efe efe dịka ekpenta,ụkwara nta na arubara.

IHE EJI EMEBE ỌGWỤ

Ọ bu ahihia na mgbọrọgwụ di iche iche,na akọrọngwa ndi ọzọ sitere n’ahụ anụmanụ na ihe ndi ọzọ bụ ihe eji agwọ ọgwụ.

 

IREKWA OGWU

Nke a pụtara inye ọgwụ a gwọtara agwọta ihe ọ na-eri.Nke a ga-eme ka ọ na-adiwanye ire.Ndi ma ọ bụ onye gwọrọ ọgwụ na-eme nke a dika dibia gwọrọ ọgwụ siri nyee ha n’iwu.Ha na-eme nke a n’ọnwa ma ọ bụ otu  ugboro n’afọ ọ bụla.Nke a gosikwara ofufe na nkwenye ndi igbo nwere n’ọgwụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *