Take a fresh look at your lifestyle.

FEG kwadoro NSIP Draft Bill.

Timothy Choji, Abuja dere ya na bekee.

0 475

 

 

Ụlọ ọrụ Federal Executive Council nke Nigeria (FEC), akwadola akwụkwọ iwu National Social Investment Programme (NSIP) Establishment Bill, 2022.

Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma mmadụ, njikwa ọdachi na mmepe mmekọrịta ọha na eze, Sadiya Umar-Farouq, kpughere nke a na ndị nta akụkọ State House na Wednesday na Abuja, isi obodo mba ahụ.

“Ọ bụ Iwu Executive, pụtara inye nkwado iwu na NSIP; guzobe ya dị ka ụlọ ọrụ kwekọrọ n’atụmatụ President Buhari ịwepụta 100 nde ndị Naijiria na ịda ogbenye n’afọ 2030.”

Umar-Farouq kwukwara na kansụl ahụ kwadoro atụmatụ nkwado na nzaghachi ihe mberede nke mba Nigeria; iji mee ka usoro nzaghachi dị mma na nke dị irè iji gboo idei mmiri na mba ahụ.

Dị ka ya si kwuo, “Atụmatụ a ga-abụ akụkụ dị iche iche na atụmatụ nke ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nke na-akọwapụta ọrụ na ọrụ doro anya nke ndị niile metụtara ya na-etinye aka na njikere  igbo ide mmiri, mbelata,.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *