Ekoli, Edda di n’Ebonyi steeti bu obodo malitere gboo chekwawa umunwaanyi maka ituta ime mkpuke, ibute oria na-efefe nakwa mmeru umuaka site n’omenala ha kporo igba olo.
Olo bu iyi di n’Ekoli burukwa Arusi nke ndi obia anaghi aga bu nke ndi Ekoli kwenyesiri Ike na o na-echekwa ha n’ihe mberede di iche iche.
A na-eme emume olo kwa afo ma abanye onwa Apreelu. O bu eze alusi obodo Ekoli na-ekwubi ubochi olo ga-ebido.
Ndi isi umunwaanyi Ekoli na enwere okuko na ihe ndi ozo gakwuru eze alusi ka o gbaa afa igwa ha ubochi olo ga-amalite.
Nne na Nna na-akwado umu ha ruru afo ise ruo na iri bu ndi choro ime ya bu emume.
N’izu ahu a na-akwado ha n’uzo puruiche maka ya bu emume.
Ha na-eyi naani mbenukwu, ihe onu na ihe aka di iche iche maka icho mma. Ha na-adi otu a gagharia obodo niile ugboro ugboro.
Umuaka amabeghi nwoke bu ndi na-ebido emume a mgbe ha pere mpe ruo mgbe ha toro agbogho ma o bu luo di.
Ha ga-emegide ya bu emume kwa afo ruo mgbe ha luru gi iji chekwa ahu ha dika nwaanyi.
Ufodu oge, umuaka malitere ya bu emume na-adachapu mgbe ha matara nwoke.
Leave a Reply