Take a fresh look at your lifestyle.

Onye ndu ikpeazu Soviet Union Mikhail Gorbachev alaala mmụọ

0 417

Mikhail Gorbachev, onye ndu Soviet Union ikpeazu alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ iri itolu na otu.

Gorbachev, bụ onye biri agha uche Soviet Union na mba ndị si Ọdịda Anyanwu Yurop buru onwe ha ọtụtụ afọ .

Gorbachev weghara ọchịchị n’afọ 1985, were mepere ụwa ọnụụzọ otu USSR dịka o wetara ọtụtụ mgbanwe.

Mana o nweghụghị ike igbochi nkụsa otu Soviet Union, bu ebe Rọshịa ọhụrụ si pụta.

Ihe ndị ndu mba ụwa na-ekwu maka ọnwụ ya

Dịka ozi ọnwụ Gorbachev pụtara, ọtụtụ ndị ọrụ na-eru n’okwu ewepụtala ozi mwute maka ọnwụ ya.

odeakwụkwọ ukwu otu United Nations bụ Antonio Guterres kọwara Gorbachev dịka onye ndu na mba ụwa ịchọ udo na-amasị ma sị, “Ọnwụ ya wutere m rinne”.

Praim Minista mba Briten bụ Boris Johnson tokwara maka idi ike nwe ike wụsị agha uche dara na Yurope ọtụtụ afọ dịka o kwuru na ọnwụ ya wutere ya.

Onyeisiala mba Fransi bụ Emman Macron kwuru n’ozi ya nke o wepụtara na Twitter sị: “Ozi iti aka n’obi maka ọnwụ Mikhail Gorbachev, nwoke udo, onye mkpebi o nwere mepere ndị Rọshịa ụzọ nwereonwe. Uchu o tinnyere n’ịchọ udo na Yurop gbanwere akụkọ anyị nile.”

Onye bụdị Mikhail Gorbachev?

Mikhail Gorbachev bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Rọshịa nakwa Soviet union, otu jịkọrọ mba ndị dị n’Ọwụwa Anyanwu Yorup kwenyeburu na kọmụnizm tupu ha ekesaa dịzịe mba 15.

A mụrụ ya n’abalị atọ nke ọnwa Maachị afọ 1931 na Privol’noe, Rọshịa.

Ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu otu Soviet Communist Party, nakwa onye ndu mba ahụ n’afọ 1985.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *