Take a fresh look at your lifestyle.

Elon Musk ọ kwadoro Peter Obi? Lee nke bụ eziokwu

0 571

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia ọkachasị na mpaghara West Afrịka na-egosi ebe Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ SpaceX na Tesla Motors kwadoro Peter Obi ji ọkọlọtọ Labour Pati azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023.

O gosikwara ebe Musk kwere nkwa na ya na Obi ga-arụkọ ọrụ ma o merie na ntuliaka ahụ.

Ihe onyonyo a dị naanị tịkọm iri na otu (11 seconds) bụ nke a na-ekesa na WhatsApp, Twitter nakwa Facebook bụ nke adịgboroja si na mkparịtaụka Musk na Sam Altman nke Y Combinator nwere n’ọnwa Sepụtemba afọ 2016.

A rụgharịrị ihe onyonyo ahụ arụgharị, ma tinye olu Musk ka ọ dị ka ọ kpọrọ aha Peter Obi ji ọkọlọtọ Labour Pati azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

Nyocha ọzọ ngalaba BBC Disinformation mere gosiri na e ji akara websaịt a https://elontalks.com/ rụọ ihe onyonyo adịgboroja a.

Akara websaịt a na-ekwe ka ndị mmadụ rụgharịa ihe onyonyo Elon Musk ma gbanwee okwu ya.

A na-ewepụkwa akara gosiri njirimara websaịt ahụ n’ihe onyonyo dịka e si mee nke a na-ewu ewu ugbua.

Ihe onyonyo ahụ ebutela ọtụtụ okwu na soshal midia dị ka ọtụtụ ndị nkwado Peter Obi na-egosi obi ụtọ ha maka nkwado adịgboroja ahụ.

Ndị  ọzọ na-ajụ Musk ka o kwuo eziokwu ma ọ kwadoro Peter Obi n’ezie.

Ihe onyonyo a bụ ịmaatụ ụdị akụkọ ụgha a kpọrọ ‘deepfake’ bụ nke e ji tekịnụzụ emepụta nke na-ara ahụ ịchọpụta eziokwu.

‘Deepfake’ bụ usoro iji akụrụngwa tekịnụzụ artificial intelligence arụgharị ihe onyonyo, ọ na-arụ imepụta kama ụfọdụ akụrụngwa ‘software’ na-emezi ka ọ dị mfe.

Cheta na Naịjirịa ga-eme ntuliaka ịhọpụta onyeisiala ọhụrụ n’afọ 2023 ebe Peter Obi bụ otu n’ime ndị na-azọ ọkwa ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *