Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị ị kwesiri ịma maka Odili

0 539

Peter Odili,bu onye chiburu Steeti Rivas

E wezụga ihe gbasara ndọrondọrọ ọchịchị, ihe ọzọ aha Odili ji ada ụda na Naịjirịa bụ nwunye ya.

Aha ya bụ Mary Ukaego Odili, onye ọkaikpe ụkwụ na Naịjirịa a mụrụ n’afọ 1952.

Mary Odili bụ onye Mbaise n’Imo steeti lara ezumike nka n’ọkwa ya n’afọ 2022.

Na nsonos a aha Jọstịs Ọdili kpọtụụ n’akwụkwọ akụkọ dịka ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Jọstịs Odili bụ ọkaikpe n’Ụlọikpe kachasị (Supreme Court Judge), dị n’Abuja.

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ịma maka Peter Odili bụ

– Ọ bụ onye Ogba/Egbema/Ndoni dị na Rivas steeti.

– Ọ gara akwụkwọ na Mahadum Nigeria dị na Nsukka.

– Ọ mechara gụpụta akwụkwọ ya na Mahadum Liverpool dị na mba Briten.

– Ọ lụrụ Mary Ukaego Odili n’afọ 1979.

– H amụrụ ụmụ anọ bụ Adaeze Odili, Njideka Odili, Chinelo Odili na Peter Odili nke ọbere.

– A họpụtara na ndị so nochi anya Rivas steeti n’ọgbakọ akpọrọ Constituents Assembly n’afọ 1988/89.

– Ọ kwuru na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala n’okpuru otu PDP n’afọ 2007 mana ọ mechara ritue ka Umaru Musa Yar’Adua were ọkwa ahụ.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *