Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe ukwu ekwuola ka akpụga Ahmed Idris ụlọ mkpọrọ Kuje

0 430

Ụlọikpe kachasị n’Abuja enyela iwu ka ejichie onye bụbu ọgụego ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Idris nakwa mmadụ atọ ọzọ n’ụlọ mkpọrọ.

Cheta na akpụpụrụ ha ụlọikpe make ebubo izupu ego karịrị otu nari ijeri naira nke ha gọrọ na ha ezughi.

Aha ndị atọ ọzọ e so kpụpụ ụlọikpe bụ Olusegun Akindele, Mohammed Usman nakwa ụlọọrụ Gezawa Commodity Market and Exchange Limited.

Ọkaiwu Idris bụ Chris Uche rịọburu ụlọikpe ka enye Idris ikike ịsi n’ụlọ na-abịa ụlọikpe n’ihi na EFCC ji akwụkwo njem ya.

Ọ rịọkwara na kama a ga-akpụpụ ya Kuje, ka akpọnye ya ndị EFCC mana ọkaikpe Adeyemi Ajayi egeghi ya ntị.

E bụgharịrị ikpe ya rue ụbọchị 27 nke ọnwa Jụlai.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *