JJc Skills kwupụtara nkewapụ alụmalụ ya na onye na-eme ihe nkiri Nollywood bụ Funke Akindele.
Stephanie Simon depụtara ya na bekee.
JJc Skills kwupụtara nkewapụ alụmalụ ya na onye na-eme ihe nkiri Nollywood bụ Funke Akindele.
Onye na-eme ihe nkiri Naijiria, onye na-ede abụ, na onye na-emepụta ihe onyonyo bụ Abdulrasheed Bello ka ama dịka JJC Skillz ekpughere na alụmdi na nwunye ya na onye na-eme ihe nkiri, bụ Funke Akindele-Bello ebiela.
JJC Skillz, onye n’April nke afọ a gọnahụrụ akụkọ banyere nsogbu alụmdi na nwunye ya, kwadoro mmepe ahụ n’ihe ntinye na ibe Instagram ya na Tọzdee, June 30.
Onye mere ihe nkiri ahụ dere, sị, “Ezigbo ndị enyi na ezinụlọ, ọ dị m mkpa ime ka unu mara na mụ na Funke ekewapụla. Mgbe ọ dịgidere, anyị na-ekerịta ọtụtụ ihe ọnụ ma mepụta ụmụaka 2 mara mma.
“Afọ abụọ gara aga siri anyị ezigbo ike. Ama m na anwala m ike m imezi ihe mana ekwere m na ọ bụ ihe agaghị arụkwazi ugbu a. Ọnwa atọ gara aga na nkwusi ike nke Funke, apụrụ m n’ụlọ ma ewezuga AMVCA enweghị ike ime ka Funke nọdụ ala n’ụzọ dị mma iji kwurịta ọdịnihu nke mmekọrịta anyị.
“Ana m ọkwa ọkwa a ka ọha na eze mara na anyị abụọ na-achụso ndụ dị iche iche. Anyị ka nwere okwu ndị dị mkpa ka e lebara anya dị ka njide na ọdịmma nke ụmụ anyị, bụ nke kachasị mkpa yana mmasị azụmahịa nke a ga-ewepụ ma enweghị m obi abụọ na a ga-edozi ihe ndị a n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ. ”
Leave a Reply