Onye isi ala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị na-achụ nta ego ka ha leba anya karịa ihe ịma aka n’ihu na-eche ndị ụwa ugbu a ma lekwasị anya na ohere ha nwere n’ihi na ọ dịghị ihe ịma aka na-enweghị ohere na ngwọta.
Onye isi ala Buhari kpọrọ oku a na Tọzdee na Madrid, mgbe ọ na-ekwu okwu nzụkọ azụmahịa nke Spain-Nigeria nke ụlọ ọrụ azụmahịa nke Spanish na Federal Ministry of Industry, Trade and Investment haziri n’oge nleta steeti ya na mba ahụ.
Onye isi ala gwara nzukọ nke ụlọ ọrụ Spanish na Nigeria na ndị na-etinye ego ka ha leba anya n’Africa maka ohere dị na ya.
Leave a Reply