Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere Sinatọ Abaribe na Sinatọ Ekweremadu ji sina ha agaghi esi azọ ọkwa Gọvanọ n’aha PDP

0 338

Pati People Democratic Party (PDP) ga-eme ntuliaka ime ụlọ ịhọpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ na steetị dị iche iche na Wenezde abali iri abụọ na ise Mee afọ 2022.

Ụfọdụ ndị a ma ama na pati ahụ chọburu ịzọ ọkwa Gọvanọ pụtara n’ụtụtụ taa ma kwuo na ha agaghịzi esonye na ntuliaka ime ụlọ ahụ.

Ndị a bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchịteanya Abia South nakwa Sịnetọ Ike Ekweremadu na-anọchiteanya Enugu West n’ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa.

Nkwupụta ha a gbara ọtụtụ ndị mmadụ gharịị maka na ndị a anọteela aka n’ụlọomeiwu ma nwee agba na pati PDP nke steetị ha.

Nke a mere ọtụtụ mmadụ ji na-ajụ ‘kedụ ihe mere ndị a ji sepu aka n’ịzọ ọkwa a?’

Gịnị mere ha ji wụsa ọwa?

N’ozi Abaribe wepụtara n’ụbọchị Wenezde iri abụọ na ise nke onwa Mee, nke ọ kpọrọ “Agaghị m esonye na ntuliaka ime ụlọ PDP n’Abia Steeti”.

Abaribe sị na ihe bụ isi isekpu ntị mere o jiri sepu aka n’emume ahụ bụ na ndị “Papa Nnukwu” ekweghi inye ndị niile na-azọ ọkwa ohere nhatanha.

Ọ sị nke pati ahụ chọrọ iji naanị mmadụ atọ a kpọrọ ‘adhoc delegates’ na-abụghị ndị delegates niile kwesịrị isonye na ntuliaka ahụ.

Abaribe sị na ụlọọrụ Inec ekwuola na ha akwadoghi ụdị atụmatụ ntuliaka ime ụlọ ahụ nke pati ya n’Abia chọrọ ime.

N’okwu ya “Mụnwa bụ Sịnetọ Enyinnaya Harcourt Abaribe agaghị esonye n’atụmatụ a.”

“Agaghị m esonye na ntuliaka ime ụlọ nke PDP maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Abia Steetị ga-adị na Wenezde 25 Mee, 2022, isonye na ya bụ ịkwado mpụ na nrụrụaka nke ụlọikpe ga-elebeanya na ya.”

Abaribe gara n’ihu gwa ndị nkwado ya ka ha dere jụụ na ọ ga-ekpuhe ihe ọzọ ọ ga-eme n’oge na-adịghị anya.

N’otu aka ahụ Sịnetọ Ike Ekweremadu wepụtara ozi site n’ọnụ Ogbo Asogwa bụ onye na-ahazi achụmnta vootu ya.

N’okwu ya “Nke a bụ ime ka ndị nkwado anyị na Naịjirịa mara na Sịnetọ Ike Ekweremadu agaghị esonye na ntuliaka ime ụlọ nke PDP maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugwu Steetị ga-adị na Wenezde 25 Mee, 2022.

“Anyị na-ekele ndị nkwado anyị nakwa ndị Naịjirịa maka ịdọnyere anyị ukwu ịhụ na e hiwere ụzọ a ga-eji nwete Enugwu ọhụrụ”

“Anyị na-arịọ ka unu dere jụụ na anyị ga-eme ka unu mata mkpebi nakwa atụmatụ ọhụrụ anyị ga-ewepụta.”

O nwebeghi onye maara kpọkwem ihe mere Ekweremadu jiri sepu aka ya na ntuliaka ime ụlọ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *