Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Zulum akasiela Chief Imam nke Borno 

0 748

Aka n’achi Steeti Borno bụ,Gọvanọ Babagana Umara Zulum nọrọ n’abali ọbọchi Satọọde kasie ezinulo  Yarima Gimba obi maka ọnwụ nwa ha nwoke,nwanne ha bụ,Mohammed Yarima Gimba onye gbara afọ iri ise na abụọ tupu ọla mụọ n’ụbọchi Tuuzde abali atọ nke ọnwa Mee afọ 2023.

 Zulum gara n’ụlọ late Sheikh Idrisa Kadi ije kasie ezinụlọ ya obi maka ọnwụ Hajiya Fusam Kadi bụ onye gbara afọ iri itolu na asatọ tupu ọla mụọ,dika ọyachara obere ahụ.Gọvanọ a kpere ekpere ka mkpụrụ obi laaa n’ndukwa.

Nke dika ibeya ọbụ Chief Imam nke Borno Imam Laisu bụ onye nabatara Zulum na obi Imam Ibrahim Ahmed ibia kasie ha obi maka ọnwụ nwa ha nwoke bụ, Zannah Ali Imam onye gbara afọ iri anọ na isii tupuu ọla mụọ. Imam Laisu kpere ekpere maka mkpụrụ obi ndia nwụrụ anwụ ma kele Gọvanọ Zulum n’aha ndi ezinụlọ amaka ibia nọyere ha.

Zulum jiri ohere a kwusi na ebe anarụ ụlọ akwụkwọ Islamiyah school nke Kofa biyu ihụ ka ọrụ si aga.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *