Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Naịjirịa, Zubairu Dada kwuru na mmekọrịta obodo a na Russia na Ukraine ka dịgidere.
Dada kwuputara nke a na Abuja na Tọzdee, mgbe ọ na-aza ajụjụ sitere n’aka ndị nta akụkọ na mkparịta ụka ozi kwa izu nke Òtù Na-ahụ Maka Nkwukọrịta Onye isi ala haziri.
O kwuru na agha na-aga n’ihu n’etiti mba abụọ ahụ emetụtaghị mmekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo a na mba abụọ ahụ.
Minista, onye nnọchiteanya Naijiria na-adịgide adịgide na United Nations, Prọfesọ Tijjani Bande, kwuru na ọ dịghị nsogbu ọ bụla, n’etiti Nigeria na Russia na Ukraine.
Ọ sịrị: “Naijirịa emebibeghị mmekọrịta ya na Rọshịa na enwere ọtụtụ njikọ dị n’etiti Nigeria na Russia. Agụmakwụkwọ bụ otu. Ọ dịghị ka Naịjirịa na Rọshịa na-alụ ọgụ.
Leave a Reply