Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:
1.Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị
2.Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
3.Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
4.Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n’ụlọ ọgwụ
5.Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka
6.Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka
7.Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n’ụlọ gị
8.Ahụ rịa gị, ga n’ụlọ ọgwụ
9.Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile
Leave a Reply