Onye ndu ụlọ nnọchiteanya enwela nzụkọ ya na ndi isi ọrụ nchekwa maka ọnọdụ enweghi ezi nchekwa n’ala anyi.
Nzụkọ a gafere elekere ise bụ iji chọ ụzọ ka nma nye ezi nchekwa,nkea bụ maka nkusu a akusuru ụgbọ-oloko si Abuja eje Kaduna na ọdọ ụgbọ elu nke steeti Kaduna.
Tupu amalita nzuko a bu nke agbachiri uzo,onu n’ekwuru ndi omiwu bu, Femi Gbajabiamila kwuru “Onye ọbụla ga etinye oke ya ihu na enwere ezi nchekwa n’ala Naijiria.”
Mgbe ọna agwa ndi nta akụkọ okwu bụ,Mazi Gbajabiamila kwuru na nzukọ a bụ oke ndi omiwu ji iji hu na enwtara ezi nchekwa,ihe ekwuru na nzukọa abụghi maka ọhaneze.
Leave a Reply