Take a fresh look at your lifestyle.

Prezidenti Buhari ka bụukwa isi nkume ụlọ nke otu APC – Onyeudu Sineti  

0 558

Prezidenti ndi Sineti bụ, Ahmad Lawan, kwuru na onyeisiala bụ, Muhammadu Buhari gana ahoputakwa ndi ndu otu All Progressives Congress (APC) ma ohapucha oche ọchichi n’afọ 2023.

Sinetọmere ka amata nke a na oge ọgbakọ National Convention nke were onodu na ogige Eagle Square,na Abuja,n’ubochi Satọọdee.

Ọ gara n’ihu kwuo na ebe onyeisiala gbara mbọ mee ka udo di n’etiti otu ndọrọndọrọ a na agbanyeghi etu ihe si aga,kwesiri ka ọna enye otua ntuzi aka mgbe nile.

Ma kwu na onyeisiala agbala mbọ ebe odi ukwu iru akwa mmiri Niger nke abụọ ,bu nke aga agbape na ngwucha afọ a.

Sinetọ Lawan kọwaputakwara ọgbakọ National Convention dika ọpụrụ iche nke na egosi na otu ndọrọndọrọ a ga eweputakwa onye ga achi ala anyi ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *