Ụbọchị ncheta ndị nne na-abụ nnukwu emume n’ụlọụka nakwa ụfọdụ ezinaụlọ.
Nke a emeela ka ụfọdụ ndị na-ajụ “oge ọbụla unu akpụrụ ụbọchị ncheta ndị nne n’ọnụ, ụbọchị ncheta ole ka ndị nne nweziri?”
Mana ụbọchị ncheta ndị nne ole ka e nwere?
Ụbọchị ụka nne nke taa (27 nke ọnwa Maachị) bụ nke mbụ e nwere n’afọ 2022.
Ọ bụ nke ndị ụka Anglịkan na-eme iji kwanyere ndị nne ugwu n’ụlọụka ha; a na-eme ya bụ ncheta ụmụnwaanyị n’ụbọchị Sọnde nke anọ n’ime oge ibu ọnụ ‘Lent’.
Ndị ụka Katọlik na-emekarị ụbọchị ndị nne nke ha n’ụbọchị ụka ma e mechaa Lent (ha anaghị eme ụka nne ma ọ daba n’oge Lent).
Na mba Amerịka na ọtụtụ mba ndị ọzọ, a na-eme ncheta ndị nne na Sọnde nke abụọ n’ọnwa Mee kwa afọ.
Ụbọchị ndị nne dị iche n’ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị nke bụ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị kwa afọ ọbụla.
Etu ndị nne Naịjiria si pụọ iche na ndị nne ndị ọzọ
Onye ọbụla ị jụrụ ajụjụ maka nne ya ga-agwa gị na ọ bụ nne nke ya kacha mma, mana kedụ ihe ndị mere ndị nne Naịjirịa ji pụọ iche na ndị ọzọ?
Na Naịjirịa, ndị nne nwere akparamagwa dị iche na-ewezuga ha na ndị nne ndị mba ọzọ.
Ọmụmatụ akparamagwa ndị a na-esite n’okwu ọnụ ha, etu ha si eme ma ha nwee ọbịa, etu ha si azụ nwa, etu ha si elekọta ezinaụlọ wdgz.
BBC Igbo chọrọ ịgba “ọpụrụiche” ndị nne Naịjirịa n’anwụ n’ụzọ ị na-atụwaghị anya:
Etu ndị nne si pụọ iche
1) Ọmụrụ nwa eri nri:
Onye ọbụla ma na enweghị ihe karịrị ịhụnanya nne na-enwe ebe nwa ya nọ, mana ọ bụghị oge niile ka ịhụnanya ahụ na-eru na nri.
Ọtụtụ oge ka nne na-enye nwa ya ihe niile ọ chọrọ tụmadi nri ịhụ na o rijuru afọ, mana kedụkwanụ maka oge ndị ahụ ọ ga-amara ụma zie gị ozi ga-akpọpụ gị ebe ọ nọ eri nri?
Mgbe ọ ga-abụ tupu ị gachaa bata ọ bụrụ na o richaala ihe ahụ?
2) Mkpịsị azịza:
Welie aka gị elu ma ọ bụrụ na nne gị ji azịza zụtara gị akpụkpọụkwụ.
Kama ndị nne ga-akpọro gị gaa ahịa, ha ejiri mkpịsị azịza agbajiri agbaji mata etu ụkwụ gị ha.
Ebe o si kacha mma bụ na akpụkpọụkwụ ahụ ha na-eji mkpịsị azịza ahụ azụta na-abụrịrị ka ụkwụ gị ha.
3) Iketa ‘ngwugwu’:
Ndị nne Naịjirịa enwere ike ịga emume na-ewelataghị ngwugwu si ebe ahụ; ọ bụ anụ, azụ tụmadụ iji akwụkwọ keta osikapa?
Mara na enweghị ihe e kere ebe ahụ maọbụ na a tudoro ha egbe n’isi ka ha ghara ikere ihe. Ihe ọzọ ha ma eme ọfụma bụ ịzụta “ihe ahịa”.
4) Ego:
Ọ bụrụ na nne gị anapụghị gị ego mmadụ nyere gị oge ị bụ nwantakịrị gwa gị ka o jidere gị ya, ị gaghị enyo ma ọ bụkwa nne gị?
Ọtụtụ oge ị gaghachị ka ị jụọ ese ego gị, ọ bụrụ na ego gị adaala mmiri. Kama ọ ga-enyeghachị gị ego ahụ, ọ ga-ebido gbawa gị ụgwọ ego niile o tinyere n’isi gị bido n’oge ị bụ nwata ruo ebe ị ha mgbe ahụ.
Ọ ga-echetakwara gị etu o si buru gị n’afọ ọnwa itoolu, ma etu o si taa ahụhụ ka ọ na-amụpụta gị.
5) Ikpuchi mmehie:
Ugboro ole ka nne gị gbochiri ntaramahụhụ nna gị gaara enye gị maka ihe ọjọọ ị mere?
Ị chetakwara mgbe ndị ọ ga-agwa gị gaa laba ụra tupu nna gị anwụchie gị; ka ị nwee ike gbalahụ ụtalị a ga-apịa gị?
Makana ọ ma na iwe foro chi agbala ọla.
6) Aka ntị:
Nne gị ọ gbara gị aka ntị maọbụ tie gị ihe ma mecha rịọ gị biko?
N’ụwa nke a? Ndị nne Naịjirịa agaghị arịọ gị biko ma ha tie gị ihe, mana ha nwere etu ha na-eji aghụghọ arịọ mgbaghara nke ha.
Ndị nne mee gị ihe ọjọọ, emechaa ha nwere ike nye nri ka nke ụmụnne gị ndị ọzọ kwuo “mana ọkwa ị ma na ị na-enye nsogbu?”, “Ị rijukwara afọ ka ị chọrọ irikwu?”, “gaa zụtara m ihe ntagharị ọnụ” (nke ọ ga-abụ na ị zụtachaa ya, o nyetu gị nke ị ga-eji chefuo ihe o mere gị).
Leave a Reply