Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ikpe Nnamdi Kanu si aga n’ụlọikpe

0 400

Ụlọikpe Ukwu dị n’Umụahịa, Abia steeti ehighaarịela banyere nnwụchi a nwuchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya nke ndị ọkaiwu ya gbara gọọmentị Naijiria gaa abalị iri abuo na asaa ọnwa Eprel afọ 2022.

Nkea bụ dịka akwụkwọ ozi Aloy Ejimakọr bụịọkaiwu Kanu na otu Ipob siri kwuo.

Dịka akpọpụtara ya bụ ikpe, ndị kwesịrị ịnọchịte anya Gọọmentị Naijirịa anọghị n’ụloikpe agbanyeghị na enyere ha akwụkwọ maka ya bụ ikpe.

Ọkaiwu Ejimakor na-arịọ ụlọikpe ka ha tinye anya n’ikpe gbas

Ya mere ka ọkaikpe bụ Evelyn Anyadike jiri hiaria ya bụ ikpe iji chọpụta ma ụlọikpe ahụ ọ kwesịr ma tozuo ikpe ya bụ ikpe.

Ọkaiwu Kanu na Ipob bụ Aloy Ekimakor gbara gọọmentị Naijirịa akwụkwọ maka etu ọ siri kwuo na nwuchi na mkpọlata Kanu site na Kenya akwadoghị iwu nke hiwere isi na ngalaba 12(4) n’iwu ‘African Charter on human and Peoples Rights’.

Ejimakor kwuru na ikpe ọgbara bụ kwa maka ahụhụ na mmekpa ahụ ọ sị na-emegburu Kanu mgbe anwụchiri ya na mba Kenya.

Ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị dị n’ime akwụkwọ a ọkaiwu Kanu gbara bụ

1) Na etu esiri nwuchie Kanu esoghị usoro ziri ezi, ma sịkwa na etu esiri zoo Kanu abalị asatọ nke bụ na enweghị onye ma ebe ọnụ ezighịkwa ezi, ma isi akwara ha agbara maka ịjụ ịkpọpụta Kanu n’ụlọ ikpe na mba Kenya megidere iwu mamegide ikike dịịrị onwe.

2) Akwụkwọ a kwukwara na ijide Kanu n’ebe gọọmentị mba Kenya na-akwadoghị ma taa ya ahụhụ esoghị iwu dịka ikike dịịrị onwe siri dị

3) Akwụkwọ ikpe a kwuru na usoro iwu nke ngalaba 12(4) kwuru na izupu mmadụ site na mba gaa mba ọzọnke na-eribeghị isi n’iwu na mba ebe ejidere onye ahụ megidere iwu na ikike dịịrị onwe.

4) Akwụkwọ ikpe a kwuru ka ụlọikpe nye iwu nke ga-agbochi ikpe Kanu ikpe ọbụla maka etu esiri kpọlata ya na Naijirịa megidere iwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *