Take a fresh look at your lifestyle.

ADC na-eme nnukwu ọgbakọ ha n’agbanyeghị esemokwu banyere onye bụ onyeisioche ha

0

Pati African Democratic Congress’ nke David Mark nọ n’isi ya, ekwuola na nnukwu ọgbakọ ha ga-aga n’ihu n’agbanyeghị esemokwu nakwa nsogbu inweta ogige ha ga-anọ mee ọgbakọ ahụ.

Ọgbakọ a na-abịa dịka a na-atụ anya mkpebi ụlọikpe mkpegharị banyere arịrọ David Mark n’akwụwkọ ikpe ọ gbara megide ikpe banyere onye bụ onyieisioche ADC.

Cheta na Nafiu Bala kpụpụrụ ADC n’ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onyeisioche pati ahụ.

Esemokwu ahụ bụ ihe mere ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) jiri kwuo na ha agaghị ahụta David Mark maọbụ Nafiu Bala dịka onyeisioche pati ADC ruo oge ụlọikpe kpebiri ikpe ahụ.

Ọ bụ mkpebi a mere ọtụtụ ji na-ajụ ka ụlọọrụ Inec a ga-anabata mpụtara nnukwu ọgbakọ a maka na ha kwuru na ha agaghị anabata David Mark na ndị ọrụ NWC ọzọ.

Ladan Salihu bụ osote onyeisioche mgbasaozi maka nnukwu ọgbakọ aụ kwuru na ha nwere olileanya na ha ga-eweta mmeri na mkpebi ụlọikpe ahụ.

O kwuru na usoro Inec wepụtara a ga-eji mee ntuliaka afọ 2027, bụ ihe mere ha ga-eji ghara iche ka ụlọikpe kpebie ikpe ahụ tupu ha eme nnukwu ọgbakọ ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *