Ndị uweojii n’Ebonyi Steeti ekwuola na ha anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Damian Oforbuike onye kwuru nna ya maka ntakịrị esemokwu ha abụọ nwere. Ọnụ na-ekwu ndị uweojii steeti ahụ Joshua Ukandu kwuru na ọdachi ahụ mere n’obodo Ohatekwe Ukawu dị n’okpuru ọchịchị Ọnịcha nke steeti ahụ.
Ukandu kwuru na ngwangwa ndị uweojii nwetere ozi maka njinji ahụ, ha gara n’ihu ma nwụchie Damian. Ọ gbakwụnyere na a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha.
Ọ kọwara na nwaamadị ahụ gwara ndị uweojii ndị uweojii okwu ma kwuo na e ji ya n’ụlọọrụ ndị uweojii CID Ebonyi Steeti. Ndị obodo hụrụ oge ihe ahụ mere kwuru na Damian gwara nne ka ọ ga ree akpụ n’ahịa mana oge nne ya resịrị akpụ ahụ, o nyere Damian ego o retere mana o chezọrọ inye Damian akpa o ji gaa ree akpụ ahụ. Oge Damian jụrụ nne ya ebe akpa ahụ dị, nne ya gwara ya na o chezọrọ ya n’ahịa.
Ọ bụ oge a ka Damian ji nwere mma wakpo nne ya ma gbuo ya. Damian gbapụrụ ọsọ ma banye n’ime ọhịa mana ndị ntorobịa obodo nwụchiri ya. Mana tupu ha enyefee ya n’aka ndị uweojii, ndị obodo ahụ jụrụ ya ma chụpụ ya n’obodo ha. Ha kwuru na ha achọghịzi ka ọ laghachita n’obodo ọzọ.
Leave a Reply