Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọọrụ mmanụ gaasị ekwesịghị ịnọ nso ebe obibi – Gọvanọ Bassey Otu

0 68

Gọvanọ Krọs Riva Steeti bụ Bassey Otu ekwuola na ụlọọrụ mmanụ gaasị ekwesịghị ịnọ nso ebe ndị mmadụ bi ma kwuo na ọchịchị ya ga-eme ihe gbasara ya.

Otu kwuru nke a dịka ọ gara njem nleta n’obodo Edibe Edibe dị n’okpuru ọchịchị Calabar South ebe ihe gbawara n’otu ụlọọrụ mmanụ gaasị ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.

Gọvano Bassey Otu kọwara mgbawa ahụ mere n’ụbọchị Satọde abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị afọ 2026 dịka nnukwu mmebi, ma kwupụta na gọọmenti ya ga-akwụ ụgwọ ahụike n’efu maka ndị niile ihe metụtara ma tụlee ịkwụghachi ndị ihe onwuwe ha mebiri emebi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *