NDLEA anwụchiela ndị chọrọ ibu ọgwụike gaa Yurop n’ọdọụgbọelu Legọs NDLEA anwụchiela ndị chọrọ ibu ọgwụike gaa Yurop n’ọdọụgbọelu Legọs
Ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela ndi na-atụ mgbere ọgwụike chọrọ ịbu ‘mkpụrụmmịrị’ – e zoro n’ime igbe akwụkwọ, uwe oyi, na ude ahụ gaa mba Yurop.
A nwuchiri ndị a n’ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Airport dị n’Ikeja, nakwa n’otu ụlọọrụ nzipuozi dị na Legọs.
E jidere mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha tụrụ mgbere ọgwụike a chọrọ ibuga na mba Ịtali.
Otu n’ime ha bụ Friday Ehianuka dị afọ iri atọ na asaa, onye e jidere n’ụbọchị Fraịde, 20 Maachị 2026, oge ọ na-achọ ịga Rome dị na mba Ịtali.
A nwuchịrị ya ka ọ na-achọ ịbanye n’ụgbọelu Ethiopian Airlines ebe o zoro mkpụrụ ọgwụike Tramadọl (225mg) ruru puku abụọ, narị isii na iri itoolu na asatọ (2,698) n’ime mkpọ ude ahụ dị n’ime akpa ya.
Ehianuka bi na Milan, kwetara na a ga-akwụ ya ego Euro ma njem ibubata ọgwụike na mba Ịtali gara ya nke ọma.
Leave a Reply