Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu ga-ezute Eze Charles III na mba UK

0 78

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ụfọdụ nkatọ a na-akatọ atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu bụ n’ihi amaghị ihe nakwa aghụghọ.

Minista mgbasaozi bụ Mohammed Idris kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ mbaụwa na-enwe mkparịtaụka na mba United Kingdom.

Ọgbakọ ahụ bụ akụkụ nhazi a na-eme maka ọbịbịa Onyeisiala Bola Tinubu na mba UK n’ime izuụka a.

Gbasara njem ahụ, Idris kwuru na Naịjirịa na mba UK agaala n’ihu na-emekọrịta ihe kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ma gbakwunye na njem a ga-akwalite mmekọrịta ahụ.

Onye Eze Charles nke atọ ga-anabata Tinubu, n’ihe a tụrụ anya ga-abụ oge gbara ọkpụrụkpụ maka mmekọ Naịjirịa na mba UK.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *