Take a fresh look at your lifestyle.

A gbaala dibịa ‘Mmụọ Mmiri Afulanya’ n’anwụ maka ebubo ịgwọ ọgwụego mbute

0 93

Gọọmenti Anambra Steeti agbaala dibịa bụ John Paul Ezenagu e ji ‘Mmụọ Mmiri Afulanya maara n’anwụ make ebubo ịda iwu nchekwa ‘Homeland Security Law.

Ha gara n’ihu gaa n’ụlọ nwamadị a dị na Nnewi ime nnyocha ma chọpụta etu o si arụ ọrụ ịgwọ ọgwụ ya.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Soludo bụ n’ọrụ nchekwa bụ Ken Emeakayi kwuru na Ezenagu na-arata ụmụokoroọbịa na ụmuagbọghọ na-ekwe ha nkwa ibute ego ọsịsọ ma ọ bụru ha saa ahụ na mmiri dị n’azụ ụlọ ya.

O kwuru na agwa dị etu a megidere iwu nchekwa na-achị Anambra Steeti a kpọrọ ‘Homeland Security Law, ma kwuo na a dọọla ya aka na ntị maka ihe ọ na-eme mana ọ gara n’ihu na-eme ya.

Emeakayi kwuru na ọ bụrụ na e mechaa nnyocha ahụ, na a ga-enyefe ya n’aka ndị uweojii maka imekwu nnyocha ma taa ya ahụhụ ruru ya.

Ezenagu rịọrọ gọọmentị Anambra Steeti na ụmụafọ ha arịrịọ mgbaghara ma kwuo na ọ gaghị eme ya ọzọ.

O kwuru na ọ bụ ya ji aka ya gwuo olulu mmiri ahụ nọ n’azụ ụlọ ya ma chere na o nwereike ime ihe ọbụla masịrị ya na mmiri ahụ.

Agunechemba anwuchiela ‘Mmụọ Mmiri Afulanya n’ụbọchị Tọzde 12 Maachị 2026 dịka ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia si gosi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *