Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti etiti akwụsịla ikpe Mike Ozekhome ikpe

0 101

Ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi akwụsịla ikpe ọkachamara Mike Ozekhome ikpe.

Cheta na ụlọọrụ ‘Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission, (ICPC)’ kpụpụrụ Mike Ozekhome ụlọikpe maka ebubo atọ gbadoro ụkwụ n’ugha na inwe akwụkwọ ụlọ adịgboroja.

Mgbe okwu ahụ pụtara n’ụlọikpe ka onyeisi na ngalaba na-ekpe ọha ikpe bụ Rotimi Oyedepo gwara ụlọikpe na Ọkaiwu kachasị na Naịjirịa chọrọ ka ya napụ ICPC ikpe ahụ, ma rịọ ụlọikpe ka e nye ya oge ọ ga-eji tulee ihe dị n’ikpe ahụ.

Oyedepo gwara ụlọikpe na e nyere ya iwu ka ya wepụta okwu ahụ n’ụlọikpe.

N’aka nke ọzọ, Paul Erokoro na ndị ọzọ bụ ọkaiwu nọchitere anya Ozekhome enweghị etu ha si na ha achọghị ka e wepụta okwu ahụ n’ụlọikpe.

Nke a mere ụlọikpe jiri kagbuo ma wepụ ebubo niile e boro Mike Ozekhome nke ICPC ji kpụta ya ụlọikpe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *