Gọọmenti Naịjirịa akwụghị ụgwọ maka mgbapụta ụmụakwụkwọ St Mary’s Catholic School dị na Naịja steeti – Mohammed Idris
Gọọmenti Naịjirịa akatọla akụkọ na-efegharị na mpaghara mba ahụ nke kwuru na Gọọmenti Etiti kwụrụ nnukwu ụgwọ n’aka ndị omekome tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ St Mary’s Catholic School dị na Naịja Steeti.
Minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ Mohammed Idris kwupụtara n’ozi nke o binyere aka na akụkọ ahụ nke ndị ntaakụkọ mba ofesi dere abụghị eziokwu, kama ọ bụ ebubo ụgha.
Dịka o si kwuo, akụkọ ahụ bụ nke na-akwatu mmụọ na mbọ ndị nchekwa Naịjirịa na-agba kwa ụbọchị iji chekwaa ndị Naịjirịa.
“O nweghị ụgwọ ọ bụla Naịjirịa kwụrụ. O nweghị ndị omekome a tọhapụrụ.”
Ụlọọrụ ndị nchekwa dị iche iche na Naịjirịa ekwuola na ebubo ahụ enweghị eziokwu dị n’ime ya
Leave a Reply