Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ itoolu anwụọla dịka a gbara egbe n’ụlọakwụkwọ dị na Kanada

0 111

Mmadụ itoolu nwụrụ ebe mmadụ iri abụọ na ise merụrụ ahụ mgbe onye ojiegbe wakporo ma gbee egbe n’ụlọakwụkwọ nakwa n’ụlọobibi dị na mba Kanada.

Ndị uweojii sị na a hụrụ ozu mmadụ isii n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị ‘Tumbler Ridge’ dịka onye nke mezuru ọnụọgụgụ ndị nwụrụ mmadụ asaa nwụrụ dịka a kpọ ya na-aga n’ụlọọgwụ.

Ndị uweojii mechara hụ ozu mmadụ abụọ n’ụlọobibi nọ n’akụkụ ụlọakwụkwọ ahụ.

Otu nwa akwụkwọ gwara CBC na ya na ndị otu ya “wetara tebụlụ ma mechie ụzọ” n’oge a na-agba egbe ahụ.

Ndị ọchịchị sị na ha ma onye mere mwakpo ahụ mana ha akpọpụtaghị aha ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị.

Ihe ịdọ aka na ntị ebe ndị mmadụ bi kọwara onye a na-enyo enyo dịka nwaanyị yị uwe nwere ntutu isi aja aja.

Praịm minista Kanada bụ Mark Carney sị “obi gbawara” ya maka ihe mere dịka David Eby onye isi ‘British Columbia’ kwuru na nzaghachi ngwa ngwa nke ndị uwe ojii pụtara mgbe ihe a na-eme ‘gbochiri ọdachi ahụ ka ọ ka njọ”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *