Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ntọrọ mmadụ atọrọla ụmụaka atọ n’Ebonyi steeti – Ndị uweojii

0 108

Ndị uweojii nke Ebonyi steeti ekwuola na a tọrọla ụmụaka atọ n’ụtụtụ ụbọchị Satọde abalị asaa nke ọnwa Febụwarị 2026 n’isi obodo Abakiliki.

Dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyi steeti bụ Godswill Ukandu si kwuo, nke a mere na Nkwegu nke dị n’akụkụ ụlọ ndịagha nke dị n’okpuru ọchịchị Abakiliki.

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị ahụ a na-enyo enyo tọrọ otụ nwatakịrị nwoke dị afọ abụọ, ụmụntakịrị ụmụnwaanyị abụọ dị afọ anọ nakwa nke gbara afọ abụọ so na ndị a tọrọ.

Ukandu sị na ndị uweojii ka na-eme nnyocha mana ndị ntọrọ mmadụ ahụ akpọbeghị n’ekwenti maọbụ kwuo ego nnapụta ole ha chọrọ ka ndị nwe ụmụaka ahụ kwụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *