Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ekwuola na gọọmenti ya na-enyocha ihe niile mere n’ọnwụ Alex Pretti gbara afọ 37 akụkọ kwuru na ndị ọrụ ICE gbagburu na Minneapolis n’ụbọchị Satọde 24 Jenụwarị, 2026.
Trump mere ka a mata na ya ga-ewepụ ndị ọrụ ICE na Minneapolis mana o kwughị ụbọchị ọ ga-eme nke a.
Ka ọ dị ugbua, a na-eme ngagharịiwe na Minneapolis nakwa steeti dị iche iche n’Amerịka dịka Gọvanọ Minnesota bụ Tim Walz dọrọ aka na ntị ma kwuo na Amerịka nọ n’ajọ ọnọdụ n’ihi ajọ akparamaagwa ndị ọrụ ICE.
Cheta na ndị ọrụ ICE gburu otu nwaanyị aha ya bụ Renee Good na Minnesota n’izuụka atọ gara aga
Leave a Reply