Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Trump adọọla aka na ntị banyere nnukwu nzaghachi ma ọ bụrụ na Ịran gbuo ndị ngagharịiwe

0 334

Trump adọọla aka na ntị ma kwuo na Amerịka ga-azaghchi mba Ịran n’ụzọ siri ike ma ọ bụrụ na Iran gbuo ndị na-eme ngagharịiwe.

Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka onye ezinaụlọ Erfan Soltani dị afọ iri abụọ na isii a nwụchiri n’izuụka gara aga, gwara BBC na a ga-egbu ya taa bụ Wenezde 14 Jenụwarị 2026.

Awyer Shekhi bụ onye ọrụ ụlọọrụ ha-ahụ maka ichekwa ikike dịịrị ndị mmadụ, kwuru e nwere ọtụtụ ndị nọ n\ọnọdụ Soltani.

Ndị na-ahụ maka ike dịịrị onye na Amerịka, kwuru na e gbuola ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị anọ mere ngagharịiwe megide gọọmenti Ịran.

Mana Onyeisiala mba Amerịka bụ Trump na-atụle iziga ndị nchekwa iji zaghachi ihe a na-eme n’Ịran dịka okwupụtara mmanye tariffu iri abụọ na ise na mba ọbụla ha na Ịran na-azụkọ ahịa

Minista na-ahụ maka mba ofesi n’Ịran bụ Abbas Araghchi, dọrọ aka na ntị ma kwuo na Iran ga-egbochi onwe ya nye ndị “ọjọọ si mba ofesi chọrọ itinye aka n’Ịran”

Ka ọ dị ugbua, ịntanetị anaghị arụ ọrụ n’Ịran

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *