Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuliaka Yuganda 2026: A machiela ịntaneti dịka a ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala n’ụbọchị Tọzde

0 386

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Yuganda agwala ụlọọrụ na-ekesa ịntanetị ka ha kwụsịtụ ọrụ maka ntuliaka a ga-eme n’ụbọchị Tọzde 15 Jenụwarị, 2026.

Ha kwuru na ihe mere ha ji eme nke a bụ iji gbochie ozi ụgha a na-ekesa n’ịntaneti, nrụrụaka na ntuliaka ahụ, nchekwa ọhanaeze nakwa igbochi ọgbaaghara ọbụla.

Na mmalite ọnwa a, ụlọọrụ Uganda Communications Commission (UCC) kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị banyere mmachi ịntaneti abụghị eziokwu, ma kwuo na na ụlọọrụ ahụ kwụrụ chịm ịhụ na inye onye ọbụla ịntaneti na mba ahụ.

A machiri ịntaneti ruo otu izuụka na ntuliaka e mere na 2021 nke kpaliri ngagharịiwe nakwa ogbugbu ọtụtụ mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *