Ndị uweojii n’Anambra steeti ejidela mmọnwụ ahụ gara ebe a na-eme emume ma meruo igwe mmadụ ahụ.
Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti mere ka a mata nke a n’ozi o zitere BBC Igbo na Januwarị 14, 2026.
N’okwu ya “mmọnwụ ahụ wakporo ndị mmadụ n’Awgbu nọzị n’ụlọọrụ anyị ugbua”.
“Anyị na-agwa ohanaeze ọkachasị ndị Anambra steeti na ndị uweojii n’Anambra steeti akpụrụla mmọnwụ ahụ”.
Ọ sị na mmọnwụ ahụ wakporo ndị mmadụ bụ na-enweghị ihe ha mere ya n’Awgbu dị n’okpuruọchịchị Orumba Nọt.
“Ihe ahụ mmọnwụ ahụ mere kesara ebe niile ọkachasị na soshal mịdịa”
Ikenga kwuru na “ihe mmọnwụ ahụ mere jọgburu onwe ya, ọ megidere iwu, ma bụrụ ihe anyị agaghị anabata nchancha”.
Ọ gara n’ihu kwuo “anyị jidere onye nọ n’ime mmọnwụ ahụ, ebe nnyocha ka na-aga n’ihu”.
O kwere nkwa na ndị niile aka ha dị na ihe mere ga-azara ọnụ ha dịka iwu si kwuo.
Leave a Reply