Take a fresh look at your lifestyle.

EFCC: Gịnị mere ụfọdụ ikpe nrụrụaka ji egbu oge?

0 216

Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ EFCC ekwupụtala ihe mere ikpe nrụrụaka ha ji n’aka ji egbu oge tupu o ruo n’ụlọikpe.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ola Olukoyede kọwara na ịkpụpụ ndị mmadụ n’ụlọikpe maka nrụrụaka, ọkachasị ndị a ma ama bụ nke e kwesịrị ime ezigbo nnyocha doro anya.

Ọ sị na ọ bụ nke a mere ikpe nrụrụaka ji egbu oge.

Olukoyede onye kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n’ụlọmgbasaozi Channels TV sịrị n’agbanyeghị na ụfọdụ nnyocha na-egbu oge tupu ọ pụọ ụlọikpe, na nke a apụtaghị na ụlọọrụ EFCC anaghị arụ ọrụ ya.

N’okwu ya, “Tupu abalị abụọ agachaa, enwere m ike ime nnyocha ma kpụpụ onye omekome ịntanetị nke bekee kpọrọ ‘cyber criminal n’ụlọikpe”.

“Mana ya bụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ụlọọrụ ọha maọbụ onye a ma ama mere nrụrụaka, ọ na-egbu oge, agaghị m aga ụlọikpe mgbe m na-adịbeghị njikere.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *