Otu jikọtara ndịagha nnupụisi n’ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo a kpọrọ Congo River Alliance ekwuputala nkwụsị ịkwa mgbọ malite n’ụbọchị Tuzde abali anọ nke ọnwa Febụwarị 2025.
N’ozi ndị otu ahụ gụnyere M23 wepụtara, ha kọwara na ọ bụ n’ihi ọnọdụ ụmụ mmadụ mere ha ji nwee mkpebi ahụ oge ha kpachichara mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo.
Otu mbaụwa bụ UN sị na e gburu opekatampe mmadụ narị itoolu (900) n’agha ahụ dị na Goma ebe mmadụ puku abụo narị asatọ na iri asatọ (2,880) merụrụ ahụ.
Mba ndị so n’otu G7 nakwa EU akatọọla mwakpo ahụ ma kọwaa ya dịka nke megidere nkwụrụnankeonwe mba DR Kongo.
Leave a Reply