Take a fresh look at your lifestyle.

Steeti Ebonyi/Ohaukwu , :Onye omebe iwu enyela ndị obodo ya Onyinye Ekeresimesi.

Chigo dereziri ya n'Igbo.

0 490

Onye omebe iwu na-anọchite anya Ebonyi/Ohaukwu , Pastor Eze Nwachukwu Eze enyela ndị obodo ya bụ akpa osikapa, fatịlaịza na uwe iji nyere ha aka ime ekeresimesi na afọ ọhụrụ.

Ihe ndị a bụ ndị e kesara ndị isi otu All Progressives Congress APC na Ebonyi Council Area na ndị nwere obere ohere na obodo.

Nike  a mere n’Ebonyi Local Government Council Area Ugbodo.

Nwachukwu kwuru na ihe a mere bụ iji nyere ndị otu ya aka ime ekeresimesi nke ọma.

“A rịọrọ m ka e nye m votu n’oge ntuli aka, unu nyekwa m vootu unu nke ukwuu. Ọ bụ na ndabere a ka m bịara ịkele. Nke a bụ ntakịrị ụzọ isi gosi ekele m” Nwachukwu kwuru.

Onye omebe iwu ahụ kwuru na ya ga-egosipụtakwu ekele na 2024.

Ọ chọrọ ka ha mee emume ekeresimesi udo.

Leave A Reply

Your email address will not be published.