Take a fresh look at your lifestyle.

Vladimir Putin ezigarala ezinaụlọ ndị nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu ozi.

chigo.

0

 

Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ezigarala ezinaụlọ ndị nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu mere ụbọchị Wenezde ozi iti aka n’obi.

Akụkọ kwuru na Yevgeny Prigozhin bụ onyeisi ndịagha ọlụọ-ọla a kpọrọ ‘Wagner Group’ sọ na ndị nọ n’ụgbọelu.

N’ozi ya ụbọchị Tọzde, Putin sịrị, “Banyere ụgbọelu kpọkasịrị, na mbụ a na m ezigara ezinaụlọ ndị nwụrụ na ya ozi iti aka n’obi.”

” Ọ bụ nnukwu ọdachi.”

“Ozi mbụ e nwetara na-ekwu na ndị ọrụ ụlọọrụ Wagner so na ndị nọ n’ụgbọelu ahụ, ndị a bụ ndị nyere aka n’ụzọ pụrụ iche n’agha anyị na-ebu na Yukren.”

” Anyị ma ma cheta nke a, anyị agaghị echefu ya.”

Ndị ọ dị n’aka kwuru na mmadụ iri nọ n’ụgbọelu ahụ kpọkasịrị na nso Moscow nwụrụ.

bbc igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *