Take a fresh look at your lifestyle.

Gịnị kpatara ihe gbara ka ogbunigwe gbariri okporoụzọ na Saụt Afrịka?

CHIGO.

0 335

Gịnị kpatara ihe gbara ka ogbunigwe gbariri okporoụzọ na Saụt Afrịka?

Ndị ọchịchị mpaghara Hohannesburg nke mba Saụt Afrịka ka na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ihe ọdachi mere na mpaghara ahụ n’ụbọchị Wenezde dịka ihe dara ka ogbunigwe gbara ebe ahụ.

Otu onye nwụrụ na ya bụ ọdachi ebe ihe ruru mmadụ 48 bụ ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

Ndị ọchịchị obodo amatabeghị kpọmkwem ihe kpatara ọgbụgba ihe a dịka ogbunigwe, mana ha na-eche na ọ bụ gaasị dị n’ime ala gbara.

E nyela ndị mmadụ ndụmọdụ ka si na mpaghara ndị ahụ pụọ dịka a na-eche na ọzọ nwereike ịgba. Ndị ọrụ gbatagbata ka nọ n’okirikiri ebe ahụ iji kee nkwụcha.

Panyaza Lesufi, bụ onye ọchịchị mpaghara Gauteng, nke bụ ebe Johannesburg dị, gwara ndị ntaakụkọ na nnyocha mbụ ha mere egosighi kpọmkwem ihe kpatara odachi ahụ, mana nnyocha ja na-aga nihu.

Ụlọọrụ na-ekesa ikuku gaasị na mpaghara ahụ bụ ‘Egoli Gas’ kwuru na ha chọpụtara ntakịrị ohere ebe gaasị si ekupu n’okporo gaasị ha, mana nke ahụ ekwesịghị ibute ụdị ihe ọgbụgba ahụ.

Mana gọọmentị agwala ụlọọrụ ahụ ka ha nyochakwaa okporo gaasị ha ọzọ iji mara ma enwere ebe ọ na-ehi ehi.

bbc igbo

Leave A Reply

Your email address will not be published.